Pope Leo XIV akpọọla oku udo n'ụwa niile



Pope Leo XIV bụ onyeisi ụka Catholic n'ụwa niile.
Nkọwa foto, Pope Leo XIV
Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Pope Leo XIV bụ onyeisi ụka Catholic n'ụwa niile akpọọla oku udo na ụwa niile ma dọọ aka na ntị banyere akụrụngwa Artificial Intelligent (Ai).

Pope Leo XIV kpọrọ oku ahụ dịka ya na ndị mbịarambịa nwere mkparịtaụka n'oge ọ gara njem okwukwe abalị na Paris bụ isi mba France.

Pope gara zute otu Maison Bakhita centre bụ ndị na-akwado ndị mbịarambịa na mba France.

N'oge ahụ ka o kwuru sị "anyị niile nwere ịnọkọta ọnụ ma biri na udo nakwa ikwanyere onwe anyị ugwu".

O ji ohere ahụ kwuo maka uru ọrụ ụmụnwaanyị 'n'ịkwalite ịhụnaanya nakwa ime ihe n'usoro ọgbaọhụrụ".



Pope Leo XIV bụ onyeisi ụka Catholic n'ụwa niile.
Nkọwa foto, Pope Leo XIV

Ihe Pope kwuru maka Ai

Pope ji ohere njem ahụ dọọ aka na ntị maka akụrụngwa artificial intelligence (AI) ma kwuo na nke a na-anapụzị mmadụ njiri mara nakwa agwa ya.

O kwuru nke ahụ n'ụbọ Fride, September 25, 2026 nakwa ihe ndị ọzọ o kwuru mgbe ọ na-akwa ndị ọchịchị nakwa ndị isi ụka okwu na Élysée Palace..

N'okwu ya "akụrụngwa Ai emeela ka anyị na-ahapụ àgwà mmadụ anyị n'etiti ụwa akụrụngwa nkanụzụ dị iche iche gbara gburugburu".



Pope Leo XIV bụ onyeisi ụka Catholic n'ụwa niile.
Nkọwa foto, Pope Leo XIV

Ndụmọdụ Pope Leo XIV nyere ndị ụka na France

Pope ga-anọ abalị anọ Paris, isi mba France dịka ọ gara njem okwukwe ma jiri ohere ahụ kpọọ oku ka ndị ụka na mba France jisike na-eme ka ndị na-amaghị Christ mara ya.

Pope Leo XIV gwara ha edosazịna ekwukwe ha were na Christ dịka ihe ọ bụ naanị nke ha kama ha na-ekesasị ya ka ndị ọzọ nwetekwa ya.

Pope kwuru na "ikesa okwukwe ha na Christ ga-eme ka ha nwee afọ ojuju nakwa ndụ ọhụrụ.

O ji ohere ahụ chetere ha ndị Saint bụ ndị mba France gụnyere Irenaeus, Martin, and Francis de Sales nakwa ọtụtụ ndị ọzọ tinyere onwe ha n'ọrụ nkwalite ọdị mma mmadụ, ezinaụlọ, eziokwu nakwa udo na ikpe ziriezi.

Pope ji ohere ahụ kelee ndị niile bụ ndị natabara Christ ọhụrụ, ndị na-eto eto nakwa ezinaụlọ niile.

Cheta na Pope Leo XIV bụ onyeisi ụka Catholic nke mbụ gara njem okwukwe abalị anọ na mba France.

Mara na mba France ga-eme ntuliaka Onyeisiala n'afọ 2027.